15 Mgbe unu gbasara ọbụ aka unu,+ m na-ewepụ anya m n’ebe unu nọ.+ Ọ bụ ezie na unu na-ekpe ọtụtụ ekpere,+ adịghị m ege ntị;+ aka unu jupụtara n’ọbara.+
13 O wee sị: “Biko, geenụ ntị, unu ụlọ Devid. Ọ̀ bụ ntakịrị ihe n’anya unu na unu na-eme ka ike gwụ ndị mmadụ, nke na unu ga-emekwa ka ike gwụ Chineke m?+
24 I jighị ego ọ bụla zụtara m ahịhịa na-esi ísì ụtọ;+ i jighịkwa abụba nke àjà ndị ị chụrụ mee ka afọ ju m.+ N’ezie, ị manyewo m ije ozi n’ihi mmehie gị; i werewo njehie gị mee ka ike gwụ m.+