23 N’ugwu dị elu nke dị n’Izrel ka m ga-adọgharị ya,+ ọ ga-awakwa alaka ma mịa mkpụrụ,+ ghọọkwa osisi sida dị ukwuu.+ Nnụnụ niile ndị nwere ụdị nku ọ bụla ga-ebi n’okpuru ya; ha ga-ebikwa na ndò nke alaka ya.+
6 Anụ ufe niile nke eluigwe kpara akwụ́ ha n’alaka ya,+ ọ bụkwa n’okpuru alaka ya ka anụ ọhịa niile na-amụ ụmụ.+ N’okpuru ndò ya ka mba niile ndị nwere ụba mmadụ na-ebi.
12 Akwụkwọ ya mara mma, mkpụrụ ya dịkwa ọtụtụ, ihe oriri nke na-ezuru ihe niile dịkwa n’elu ya. Anụ ọhịa+ na-anọ na ndò dị n’okpuru ya,+ ọ bụkwa n’alaka ya ka anụ ufe nke eluigwe bi,+ anụ ahụ́ niile na-erikwa ihe si na ya.