Abụ Nrịgo. Abụ ọma Devid.
124 “A sị na ọ bụghị na Jehova nọnyeere anyị,”+
Ka Izrel kwuo ugbu a, sị,+
2 “A sị na ọ bụghị na Jehova nọnyeere anyị+
Mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,+
3 Ha gaara eloda anyị ọbụna ná ndụ,+
Mgbe ha na-eweso anyị iwe dị ọkụ.+
4 Mmiri gaara eburu anyị,+
Iyi gaara asọfe n’elu mkpụrụ obi anyị.+
5 Mmiri mpako+
Gaara asọfe n’elu mkpụrụ obi anyị.
6 Ka Jehova bụrụ onye a gọziri agọzi, bụ́ onye na-ewereghị anyị+
Nye ezé ha ka ọ bụrụ anụ oriri.+
7 Mkpụrụ obi anyị dị ka nnụnụ
Nke si n’ọnyà nke ndị na-esi ọnyà+ fepụ.+
Ọnyà agbajiwo,+
Anyị onwe anyị agbapụwokwa.+
8 Enyemaka anyị dị n’aha Jehova,+
Onye kere eluigwe na ụwa.”+