-
Ndị Hibru 11:32-34Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
32 Gịnị ọzọ ka m ga-ekwu? N’ihi na oge ga-agwụnahụ m ma m kọwa banyere Gidiọn,+ Berak,+ Samsịn,+ Jefta,+ Devid,+ na Samuel+ na ndị amụma ndị ọzọ. 33 Ọ bụ okwukwe ha mere ka ha merie alaeze dị iche iche,+ mee ka ndị mmadụ mewe ezi omume, mee ka e kwee ha nkwa dị iche iche,+ meekwa ka e mechie ọnụ ọdụm.+ 34 Okwukwe ha mekwara ka ọkụ ghara ime ha ihe ọ bụla,+ mee ka ha gbalaga ka a ghara iji mma agha gbuo ha,+ mee ka ha dị ike mgbe ha na-adịghị ike,+ mee ka ha bụrụ ndị dike n’agha,+ mee ka ha chụlaa ndị bịara ịlụso ha agha.+
-