Abụ Solomọn
7 “Gị nwa agbọghọ a na-akwanyere ùgwù,
Ụkwụ gị mara ezigbo mma n’akpụkpọ ụkwụ i yi.
Úkwù gị mara mma ka ihe e ji achọ mma
Nke onye na-akpụ ihe nke ọma kpụrụ.
2 Otubo gị dị ka efere dị okirikiri.
Ka mmanya a gwara agwa ghara ịkọ na ya mgbe ọ bụla.
Afọ gị dị ka ikpo ọka wit
Nke e ji okooko lili gbaa gburugburu.
4 Olu gị+ yiri ụlọ elu e ji ọdụ́ rụọ.+
Imi gị dị ka ụlọ elu Lebanọn,
Nke chere Damaskọs ihu.
Otú ogologo ntutu isi gị si awụgharị masịrị eze.
6 Nwa agbọghọ m hụrụ n’anya, ị mara ezigbo mma,
Ị mara mma karịa ihe niile na-eme ka obi tọọ mmadụ ụtọ.
8 M sịrị, ‘M ga-arịgo n’elu nkwụ
Ka m ghọrọ ụyọkọ mkpụrụ ya.’
Ka ara gị dịrị ka ụyọkọ mkpụrụ vaịn.
Ka ume ị na-ekupụ na-esi ísì ọma ka apụl.
9 Ka ọnụ* gị dịrịkwa ka ezigbo mmanya.”
“Ka o jiri nwayọọ na-agbada n’akpịrị onye m hụrụ n’anya,
Jirikwa nke nta nke nta na-abanye n’ọnụ ndị ụra na-eburu.”
11 Onye m hụrụ n’anya, bịa.
Ka anyị gaa n’ọhịa.
Ka anyị nọrọ n’ebe okooko osisi hena dị.+
12 Ka anyị bilie n’isi ụtụtụ gaa n’ubi vaịn
Ka anyị hụ ma mkpụrụ vaịn ò puola,
Ma okooko ya ọ̀ gbawaala,+
Ma osisi pomigranet ọ̀ maala ifuru.+
M ga-anọ ebe ahụ gosi gị na m hụrụ gị n’anya.+
13 Ahịhịa mandrek*+ na-esipụta ísì ọma ya.
Ụdị ọmarịcha mkpụrụ osisi ọ bụla dị n’ọnụ ụzọ anyị.+
Onye m hụrụ n’anya, m doweere gị
Ma ndị ochie ma ndị ọhụrụ.