Emọs
6 “Ndị tụkwasịrị onwe ha obi na Zayọn ga-ata ahụhụ,
Ha na ndị chere na o nweghị ihe ga-eme ha n’ugwu Sameria.+
Ha bụ ndị a na-anụ aha ha ná mba ndị a kacha mara,
Ndị ụlọ Izrel na-agakwuru.
2 Gaanụ Kalne ka unu hụ ihe na-eme.
Sikwanụ ebe ahụ gaa Hemat+ bụ́ Obodo Ukwu.
Gbadaanụ Gat nke dị na Filistia.
Ọ̀ bụ ha ka alaeze ndị a* mma?
Ka ala ha ọ̀ ka ala unu?
3 Ùnu na-ewepụ ụbọchị ọdachi n’obi unu?+
Ùnu na-eme ka tigbuo zọgbuo na-achị unu?+
4 Unu na-edina n’àkwà* ndị e ji ọdụ́ rụọ,+ na-agbatịkwa onwe unu n’àkwà* unu.+
Unu na-esi n’ìgwè atụrụ were ụmụ ebule rie, na-erikwa ụmụ ehi* gbara agba.+
6 Unu ji efere na-aṅụ mmanya.+
Unu na-etekwa onwe unu mmanụ kacha mma.
Ma ọdachi dakwasịrị Josef+ emetụghị unu n’ahụ́.*
7 N’ihi ya, unu ga-abụ ndị mbụ a ga-adọrọ n’agha.+
Unu ga-akwụsịkwa oriri oké mkpọtụ unu na-eri na-agbatị onwe unu n’àkwà.*
8 ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ejirila onwe ya* ṅụọ iyi.’+ Ihe a ka Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha kwuru,
‘“Mpako Jekọb dị+ na-asọ m oyi,
Akpọkwara m ụlọ elu ya niile asị.+
M ga-enyefekwa obodo ya na ihe juru na ya n’aka ndị iro ya.+
9 “‘“Ọ bụrụkwa na ụmụ nwoke iri afọdụ n’otu ụlọ, ha ga-anwụ. 10 Onye ikwu* ha ga-abịa bupụ ha ma kpọọ ha ọkụ otu otu. Ọ ga-esi n’ụlọ ahụ chịpụta ọkpụkpụ ha. Ọ ga-asịkwa onye ọ bụla nọ n’ime ime ụlọ ahụ, ‘Ò nwere onye ọzọ gị na ya nọ?’ Onye ahụ ga-asịkwa ya, ‘O nweghị.’ Ọ ga-asịzi, ‘Gba nkịtị, n’ihi na ugbu a abụghị oge e ji akpọ aha Jehova.’”
12 Ịnyịnya ọ̀ na-agba ọsọ n’elu nnukwu nkume?
Ka mmadụ ọ̀ ga-eji ehi kọọ ihe na ya?
Unu emeela ka ikpe ziri ezi ghọọ ahịhịa na-egbu mmadụ,
Meekwa ka mkpụrụ ezi omume ghọọ ahịhịa na-elu ilu.+
13 Unu na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe na-abaghị uru,
Unu na-asịkwa: “Ọ́ bụghị anyị mere onwe anyị ka anyị dị ike?”*+
14 N’ihi ya, ndị Izrel, m ga-eme ka otu mba bịa lụso unu agha.+
Ha ga-emegbukwa unu malite na Libo-hemat*+ ruo na Ndagwurugwu* Araba.’ Ọ bụ ihe Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha kwuru.”