Jenesis
18 Mgbe e mechara, Jehova+ pụtara n’ihu Ebreham n’akụkụ nnukwu osisi ndị dị na Mamri.+ N’oge ahụ, Ebreham nọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ya n’oge ebe niile kacha ekpo ọkụ n’ụbọchị. 2 O leliri anya hụ ụmụ nwoke atọ ndị guzo n’ebe dịtụ anya.+ Mgbe ọ hụrụ ha, o si n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ gbara ọsọ gaa zute ha, ọ kpọkwara isiala. 3 Ọ sịziri: “Jehova,* ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, biko, bata na nke ohu gị. 4 Biko, ka e kute obere mmiri saa unu ụkwụ,+ unu anọrọzie n’okpuru osisi a zurutụ ike. 5 Ebe ọ bụ na unu bịara na nke ohu unu, ka m wetara unu achịcha ka unu taa nweta ume. E mechaa, unu agawa ebe unu na-aga.” Ha sịrị ya: “Ọ dị mma. I nwere ike ime ihe i kwuru.”
6 Ebreham wee mee ọsọ ọsọ gakwuru Sera n’ụlọikwuu ma sị ya: “Mee ọsọ ọsọ! Mata sia* ntụ ọka* atọ e gwere nke ọma. Gwọọ ya, jirikwa ya mee achịcha.” 7 Ebreham gbagara n’ebe ìgwè ehi ya dị họta obere oké ehi ahụ́ dị mma. Ọ kpụnyere ya onye na-ejere ya ozi, onye ahụ emee ọsọ ọsọ gbuo ya sie. 8 O wee buru bọta na mmiri ara ehi na anụ ahụ o siri dowe n’ihu ha. Ma ọ kwụ n’akụkụ ha n’okpuru osisi ahụ ka ha nọ na-eri nri.+
9 Ha jụrụ ya, sị: “Olee ebe Sera nwunye gị nọ?”+ Ọ zara ha, sị: “Ọ nọ n’ụlọikwuu.” 10 Otu onye n’ime ha wee sị: “M ga-abịakwute gị ọzọ n’ụdị oge a n’afọ ọzọ, Sera nwunye gị ga-amụkwa nwa nwoke.”+ Sera nọ n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ahụ, nke dị n’azụ nwoke ahụ, na-ege ihe ha na-ekwu. 11 Ebreham na Sera emeela agadi, kaa ezigbo nká.+ Sera agafeela ịmụ nwa.*+ 12 N’ihi ya, Sera malitere ịchị ọchị n’obi ya, sị: “M̀ ga-enwe ụdị obi ụtọ a ebe ọ bụ na mụ akaala nká, onyenwe m emeekwala agadi?”+ 13 Jehova wee sị Ebreham: “Gịnị mere Sera ji chịa ọchị ma sị, ‘M̀ ga-amụ nwa n’eziokwu n’agbanyeghị na m meela agadi?’ 14 È nwere ihe nyịrị Jehova?+ M ga-abịakwute gị ọzọ n’ụdị oge a n’afọ ọzọ, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.” 15 Ma Sera gọrọ agọ, sị: “Achịghị m ọchị!” maka na egwu na-atụ ya. O wee sị: “Mba, ị chịrị ọchị.”
16 Mgbe ụmụ nwoke ndị ahụ biliri ka ha lawa, Ebreham so ha ka o dupụ ha. O du ha ruo n’ebe ha nọ hụ Sọdọm.+ 17 Jehova sịrị: “Agaghị m ezoro Ebreham ihe m chọrọ ime.+ 18 Ụmụ Ebreham ga-aghọ nnukwu mba dị ike, a ga-esikwa n’aka ya gọzie mba niile dị n’ụwa.+ 19 Amarala m ya, amakwa m na ọ ga-enye ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya niile iwu ka ha na-eme ihe Jehova kwuru ma na-eme ihe dị mma na ihe ziri ezi,+ ka Jehova wee meere Ebreham ihe o kwere ya ná nkwa.”
20 Jehova kwuziri, sị: “Ihe ọjọọ a na-ekwu na ndị Sọdọm na Gọmọra na-eme karịrị akarị,+ mmehie ha dịkwa oké njọ.+ 21 M ga-agbada ka m hụ ma ihe a na-ekwu gbasara ha ọ̀ bụ ihe ha na-eme n’eziokwu. Ọ bụrụ na ha anaghị eme otú ahụ, m ga-ama.”+
22 Ụmụ nwoke ahụ si n’ebe ahụ pụọ gawa Sọdọm, ma Jehova+ na Ebreham ka nọ. 23 Ebreham gakwuuru ya ma sị ya: “Ị̀ ga-ekpochapụkọta ndị ezi omume na ndị ajọ omume?+ 24 Ọ bụrụ na e nwere ndị ezi omume iri ise n’obodo ahụ, ị̀ ka ga-ekpochapụ obodo ahụ? Ọ̀ bụ na ị gaghị agbaghara ndị bi na ya n’ihi ndị ezi omume iri ise ahụ? 25 O doro anya na ị gaghị egbukọta onye ezi omume na onye ajọ omume, o wee bụrụ otu ihe ga-eme onye ezi omume na onye ajọ omume.+ O doro anya na ị gaghị eme ya.+ Ọ̀ bụ na Onye na-ekpe ụwa niile ikpe agaghị eme ihe dị mma?”+ 26 Jehova wee sị: “Ọ bụrụ na m hụ ndị ezi omume iri ise na Sọdọm, m ga-agbaghara mmadụ niile bi na ya n’ihi ha.” 27 Ma Ebreham kwuru ọzọ, sị: “Jehova, biko, ewela iwe na m katara obi na-agwa gị okwu n’agbanyeghị na m bụ ájá na ntụ. 28 Ọ bụrụkwanụ na ọ fọrọ mmadụ ise ka ndị ezi omume ahụ zuo iri ise, ị̀ ga-ebibi ndị niile bi n’obodo ahụ n’ihi mmadụ ise ahụ ọ fọrọ ka ha zuo?” O wee sị: “Agaghị m ebibi ha ma m hụ mmadụ iri anọ na ise na ya.”+
29 Ma ọ gwara ya okwu ọzọ, sị: “Ọ bụrụkwanụ na a hụ ndị ezi omume iri anọ n’ebe ahụ?” Ọ sịrị: “Agaghị m ebibi obodo ahụ n’ihi mmadụ iri anọ ahụ.” 30 Ma o kwukwara, sị: “Jehova, biko, ewela oké iwe,+ kama ka m kwutụkwuo okwu: “Ọ bụrụkwanụ na a hụ naanị ndị ezi omume iri atọ n’ebe ahụ?” Ọ sịrị: “Agaghị m ebibi obodo ahụ ma m hụ ndị ezi omume iri atọ na ya.” 31 Ma o kwukwara, sị: “Jehova, biko, ewela iwe na m katara obi na-agwa gị okwu: Ọ bụrụkwanụ na a hụ naanị ndị ezi omume iri abụọ n’ebe ahụ?” Ọ sịrị: “Agaghị m ebibi obodo ahụ n’ihi mmadụ iri abụọ ahụ.” 32 N’ikpeazụ, ọ sịrị: “Jehova, biko ewela iwe, kama ka m kwuo okwu ọzọ naanị otu ugboro a: Ọ bụrụkwanụ na a hụ naanị ndị ezi omume iri n’ebe ahụ?” Ọ sịrị: “Agaghị m ebibi obodo ahụ n’ihi mmadụ iri ahụ.” 33 Mgbe Jehova na Ebreham kwuchara okwu, ọ gawara,+ ma Ebreham laghachiri n’ụlọ ya.