Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Galeshia
2 Mgbe afọ iri na anọ gachara, m gaghachiri Jeruselem, mụ na Banabas,+ m kpọkwa Taịtọs.+ 2 Ihe mere m ji gaa bụ maka na e kpugheere m ka m gaa. M kọkwaara ụmụnna a na-akwanyere ùgwù banyere ozi ọma m na-ekwusa ná mba dị iche iche. Ma, ọ bụ naanị ụmụnna ahụ a na-akwanyere ùgwù ka m kọọrọ ya maka na m chọrọ ijide n’aka na ọsọ m na-agba ma ọ bụ nke m gbarala agba abụghị n’efu. 3 Ma, e nweghịdị onye siri ọnwụ ka e bie Taịtọs+ onye mụ na ya so úgwù,+ n’agbanyeghị na ọ bụ onye Grik. 4 Ma ihe meziri okwu ahụ ji bido bụ na e nwere ụmụnna ụgha e ji nwayọọ kpọbata,+ ndị gbebatara ka ha mee ka anyị gharazie inwere onwe anyị+ otú anyị nweere onwe anyị maka na anyị na Kraịst Jizọs dị n’otu, ka ha wee mee ka anyị bụrụ ndị ohu.+ 5 Anyị emeghị ihe ha chọrọ,+ anyị emeghịdị ya ma otu,* ka unu wee jisie eziokwu nke ozi ọma ahụ aka ike.
6 Ma gbasara ndị ahụ yiri ka è nwere ihe ha bụ,+ e nweghị ihe ọhụrụ ọ bụla ndị ahụ a na-akwanyere ezigbo ùgwù kụziiri m. Ụdị ndị ọ sọkwara ha bụrụ n’oge gara aga, ọ gbasaghị m, n’ihi na ihe Chineke na-ele abụghị otú mmadụ dị n’elu ahụ́. 7 Ma, mgbe ha hụrụ na e nyere m ọrụ izi ndị a na-ebighị úgwù ozi ọma,+ otú e nyere Pita ọrụ izi ndị e biri úgwù ozi ọma, 8 (n’ihi na ọ bụ onye mere ka Pita bụrụ onyeozi ndị e biri úgwù mekwara ka mụnwa bụrụ onyeozi ndị mba ọzọ)+ 9 mgbe ha ghọtakwara amara Chineke meere m,+ Jems+ na Sifas* na Jọn, bụ́ ndị e weere ka idé ji ọgbakọ, kwere mụ na Banabas n’aka+ iji gosi na anyị na ha ga na-arụkọ ọrụ, ka anyị wee gakwuru ndị mba ọzọ, hanwa agakwuru ndị e biri úgwù. 10 Naanị ihe ha gwara anyị bụ ka anyị na-echeta ndị ogbenye. Ana m agbasikwa mbọ ike ime ihe a ha kwuru.+
11 Ma mgbe Sifas*+ bịara Antiọk,+ agwara m ya okwu ihu na ihu n’ihi na o mere ihe jọgburu onwe ya. 12 N’ihi na tupu ndị Jems+ zitere abịa, ọ na-esobu ndị mba ọzọ eri ihe.+ Ma mgbe ha bịarutere, ọ kwụsịrị iso ha eri ihe na iso ha akpa, maka na ọ na-atụ egwu ndị ahụ e biri úgwù.+ 13 Ndị Juu ndị ọzọ sokwaara ya mewe ihu abụọ ahụ. Banabas sodịịrị ha mewe ihu abụọ ahụ ha mere. 14 Ma mgbe m hụrụ na ha anaghị eme ihe bụ́ eziokwu a kụziiri unu mgbe e ziri unu ozi ọma,+ m nọ n’ihu ha niile gwa Sifas,* sị: “Ọ bụrụ na gịnwa bụ́ onye Juu na-ebi ndụ ka ndị mba ọzọ kama ibi ndụ ka ndị Juu, gịnịzi mere i ji chọọ ime ka ndị mba ọzọ mewe omenala ndị Juu?”+
15 Anyịnwa bụ ndị Juu mgbe a mụrụ anyị. Anyị abụghị ndị mba ọzọ bụ́ ndị na-eme mmehie. 16 Anyị ghọtara na ọ bụghị mmadụ ime ihe e kwuru n’iwu ga-eme ka a kpọọ ya onye ezi omume, kama ọ bụ naanị ma onye ahụ nwee okwukwe+ na Jizọs Kraịst.+ N’ihi ya, anyị nwere okwukwe na Kraịst Jizọs ka e wee kpọọ anyị ndị ezi omume maka na anyị nwere okwukwe na Kraịst, ọ bụghị maka na anyị na-eme ihe e kwuru n’iwu, n’ihi na e nweghị onye* a ga-akpọ onye ezi omume maka na ọ na-eme ihe e kwuru n’iwu.+ 17 Ma, ọ bụrụ na e wekwaara anyị ka ndị mmehie maka na anyị na-agbalị ka a kpọọ anyị ndị ezi omume n’ihi okwukwe anyị nwere na Kraịst, ọ̀ pụtara na Kraịst na-ejere mmehie ozi? Mbanụ! 18 Ọ bụrụ na m na-arụghachi ihe ndị m kwatuburu, m na-egosi na m na-emebi iwu. 19 N’ihi na m nwụrụ anwụ ma a bịa n’idebe iwu,+ ka m wee dị ndụ jewere Chineke ozi. 20 A kpọgidere mụ na Kraịst n’osisi.+ Ọ bụghịzi mụnwa dị ndụ,+ kama Kraịst dị ndụ, mụ na ya dịkwa n’otu. N’eziokwu, otú m si ebi ndụ ugbu a dabara n’okwukwe m nwere n’Ọkpara Chineke,+ onye hụrụ m n’anya ma nyefee ndụ ya n’ihi m.+ 21 Anaghị m ajụ amara Chineke,+ n’ihi na ọ bụrụ na ime ihe e kwuru n’iwu na-eme ka a kpọọ mmadụ onye ezi omume, ọ pụtara na Kraịst nwụrụ n’efu.+