Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Hibru
5 Mmadụ ọ bụla a họpụtara ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà, a họpụtara ya ka ọ na-ejere ndị mmadụ ozi n’ihe gbasara ofufe ha na-efe Chineke,+ ka o wee na-ewetara Chineke onyinye ha dị iche iche, na-achụkwa àjà maka mmehie ha.+ 2 Ọ na-emetere ndị na-eme mmehie ebere,* ya bụ, ndị na-eme mmehie maka na ha amaghị ihe ziri ezi, ebe ọ bụ na yanwa na-emekwa mmehie. 3 N’ihi ya, ọ na-achụ àjà maka mmehie nke ya otú ọ na-achụ maka mmehie ndị ọzọ.+
4 Mmadụ anaghị ahọpụta onwe ya ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà, kama ọ bụ Chineke na-ahọpụta mmadụ, otú ọ họpụtara Erọn.+ 5 Otú ahụ ka ọ dịkwa Kraịst. O toghị onwe ya+ ma jiri aka ya họpụta onwe ya ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà, kama ọ bụ Onye nyere ya otuto gwara ya, sị: “Ị bụ ọkpara m. Abụrụla m nna gị taa.”+ 6 Dịkwa ka o kwuru n’ebe ọzọ, sị: “Ị bụ onye nchụàjà dị ka Melkizedek, ị ga-abụkwa onye nchụàjà ruo mgbe ebighị ebi.”+
7 Mgbe Kraịst nọ n’ụwa, o kpesiri ekpere ike, besie ákwá ike ma jiri anya mmiri rịọ+ Onye nwere ike ịzọpụta ya n’ọnwụ arịrịọ. A nụkwara ekpere ya n’ihi na ọ na-atụ egwu Chineke. 8 N’agbanyeghị na ọ bụ ọkpara, o si n’ahụhụ ọ tara mụta irube isi.+ 9 Mgbe e mechara ka o zuo okè,+ ọ ghọrọ onye a ga-esi n’aka ya zọpụta ndị niile na-erubere ya isi. Ọ ga-azọpụta ha ruo mgbe ebighị ebi,+ 10 n’ihi na Chineke ahọpụtala ya ka ọ bụrụ nnukwu onye nchụàjà dị ka Melkizedek.+
11 Anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-ekwu banyere Kraịst, ịkọwa ihe ndị ahụ sikwara ike n’ihi na unu aghọọla ndị ntị ike.* 12 N’eziokwu, unu ekwesịla ịbụ ndị na-akụziri ndị ọzọ ihe ugbu a, ma onye ọzọ ka ga-ebido n’isi kụziwere unu ihe ndị na-ataghị akpụ+ e dere n’okwu dị nsọ nke Chineke. Ọ bụzi mmiri ara ka a ga-enye unu, ọ bụghị nri siri ike. 13 N’ihi na onye nọgidere na-aṅụ mmiri ara amatabeghị okwu Chineke* n’ihi na ọ bụ nwatakịrị.+ 14 Ma nri siri ike bụ maka ndị tozuru etozu, ya bụ, ndị na-echebara ihe echiche nke ọma. Ha na-esi otú a azụ onwe ha* ka ha mata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ.