Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb16 Septemba p. 8
  • Emela Ihe Ndị A Mgbe Ị Na-amụrụ Mmadụ Ihe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Emela Ihe Ndị A Mgbe Ị Na-amụrụ Mmadụ Ihe
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nyere Onye Ị Na-amụrụ Baịbụl Aka Ka O Mee Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Mee Ka Ihe Ị Na-akụzi Dị Mfe Nghọta
    Hụ Ndị Mmadụ n’Anya, Mee Ka Ha Bụrụ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs
  • Otú E Si Eji Akwụkwọ Ihe Ọmụma Eme Ndị Na-eso Ụzọ
    Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Akụkụ nke 2: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
    Ozi Alaeze Anyi—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ (2016)
mwb16 Septemba p. 8

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Emela Ihe Ndị A Mgbe Ị Na-amụrụ Mmadụ Ihe

Nke E Biri Ebi
Ebe otu nwanna nwoke na-agwa onye ọ na-amụrụ ihe ọtụtụ ihe

Ikwu Oké Okwu: Echela na ị ga-akọwachara ya ihe niile otu mgbe. Jizọs ji ajụjụ mee ka ndị mmadụ chee echiche ma ghọta ihe ọ na-ekwu. (Mat. 17:24-27) Ịjụ onye ị na-amụrụ ihe ajụjụ ga-eme ka ọmụmụ ihe unu dị ụtọ, meekwa ka ị mata ihe ndị o kweere nakwa ma ọ̀ na-aghọtakwa ihe unu na-amụ. (be 253 ¶3-4) Ị jụọ ya ajụjụ, nwee ndidi ka ọ zaa. Ọ bụrụ na ọ zataghị ya, agwala ya aziza ya, kama, jirikwa ajụjụ ndị ọzọ nyere ya aka ịzata ya. (be 238 ¶1-2) Jiri nwayọọ kọwaara ya ihe otú ọ ga-aghọta ya.—be 230 ¶4.

Ịkọwa ọtụtụ ihe banyere ihe mere anyị ji aka nká

Ime Ka Ihe Gbagwojuo Anya: Agwala onye ị na-amụrụ ihe ihe niile ị ma gbasara ihe unu na-amụ. (Jọn 16:12) Ihe ị ga-elekwasị anya na ya bụ isi ihe e kwuru na paragraf unu na-atụle. (be 226 ¶4-5) Ma, ọ bụrụ na ị kọọrọ ya ọtụtụ ihe ndị ọzọ gbasara ihe unu na-amụ, o nweziri ike ime ka ihe niile gbaa ya gharịị. (be 235 ¶3) Onye ahụ ghọtahaala ihe bụ́ isi e kwuru na paragraf ahụ, gafee na paragraf ọzọ.

Ebe otu nwanna nwoke na-amụrụ mmadụ ọtụtụ paragraf nke mere ka ihe niile gbaa ya gharịị

Ịmụcha Ọtụtụ Paragraf: Ihe bụ́ mkpa anyị bụ ka ihe anyị na-amụrụ mmadụ ruo ya n’obi, ọ bụghị ka anyị mụchaa ọtụtụ paragraf. (Luk 24:32) Jiri amaokwu Baịbụl dị na pafagraf unu nọ na ya mee ka isi ihe unu na-amụ doo ya anya. (2 Kọr. 10:4; Hib. 4:12; be 144 ¶1-3) Jiri ihe atụ ndị dị mfe kọwaara ya ihe unu na-amụ. (be 245 ¶2-4) Gbalịa mata ihe onye ahụ kweere na ihe ndị na-enye ya nsogbu. Chọpụtazie otú ị ga-esi jiri ihe unu na-amụ nyere ya aka. Jụọ ya ajụjụ ndị dị ka: “Olee otú obi dị gị maka ihe ndị a ị na-amụta?” “Gịnị ka ihe a anyị na-amụ na-akụziri anyị gbasara Jehova?” “Olee uru ị ga-erite ma ọ bụrụ na i mee ha?”—be 238 ¶3-5; 259 ¶1.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya