2 Ndị Kọrịnt
8 Ma, ụmụnna anyị, anyị na-eme ka unu mara banyere obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ nke e nyere ọgbakọ ndị dị na Masedonia,+ 2 na n’oge ha nọ ná mmekpa ahụ́ n’ihi oké ule ha nọ na ya, ọṅụ dị ukwuu ha nwere kpaliri ha igosi na ha bara ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ+ site n’oké mmesapụ aka ha, n’agbanyeghị na ha dara ogbenye nke ukwuu. 3 N’ihi na dị ka ike ha hà n’ezie,+ ee, m na-agba akaebe na nke a bụ karịa otú ike ha hà n’ezie. 4 Ha onwe ha rịọsiri anyị arịrịọ ike dị ka ha kpebiri n’onwe ha, ka anyị kwe ka ha nwee ihe ùgwù nke iji obiọma na-enye ihe, ka ha kerekwa òkè n’ozi a na-ejere ndị nsọ.+ 5 Ọ bụghịkwa naanị dị ka anyị tụrụ anya ya, kama ha bu ụzọ nyefee onwe ha n’aka Onyenwe anyị+ nakwa n’aka anyị site n’uche Chineke. 6 Ọ bụ ya mere anyị ji gbaa Taịtọs+ ume na ebe ọ bụ ya malitere ya n’etiti unu, otú ahụkwa, ya mee ka ụdị iji obiọma na-enye ihe dị otú a nke unu na-enye zuo ezu. 7 Otú o sina dị, dị nnọọ ka unu bara ọgaranya n’ihe niile,+ n’okwukwe na n’okwu na n’ihe ọmụma+ na n’ịnụ ọkụ n’obi niile nakwa n’ịhụnanya a anyị nwere n’ebe unu nọ, baakwanụ ọgaranya n’iji obiọma na-enye ihe a nke a na-enye.
8 Ọ bụghị inye unu iwu,+ kama ihe mere m ji na-ekwu ya bụ n’ihi otú o si dị ndị ọzọ ọkụ n’obi nakwa iji chọpụta ma ịhụnanya unu ọ̀ bụ nke ezigbo ya. 9 N’ihi na unu maara obiọma Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-erughịrị mmadụ, na ọ bụ ezie na ọ bara ọgaranya, ọ dara ogbenye n’ihi unu,+ ka unu wee baa ọgaranya+ site n’ịda ogbenye ya.
10 Ana m ekwukwa uche m n’ihe a:+ n’ihi na okwu a baara unu uru,+ ebe ọ bụ na n’otu afọ gara aga, unu malitere, ọ bụghị naanị ime ya eme, kamakwa ịchọ ime ya;+ 11 ugbu a, mechaakwanụ ya, ka ọ ga-abụ, dị nnọọ ka e nwere ịdị njikere ịchọ ime ya, otú a kwa ka e kwesịrị imecha ya, site n’ihe unu nwere. 12 N’ihi na ọ bụrụ na unu bu ụzọ dịrị njikere, ọ bụ ihe a na-anabata karịsịa dị ka ihe mmadụ nwere si dị,+ ọ bụghị dị ka ihe mmadụ na-enweghị si dị. 13 N’ihi na ebughị m n’uche ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe,+ ma siere unu ike; 14 kama site n’ime ka ihe hara nhata, ka ihe mafọọrọ unu wee mejuo ihe kọrọ ha ka ọ dị ugbu a, ka ihe mafọọrọ ha wee mejuokwa ihe kọrọ unu, ka e wee nwee ịha nhata.+ 15 Dị nnọọ ka e dere, sị: “Onye nwere ihe dị ukwuu enweghị ihe dị ukwuu gabiga ókè, onye nwere ihe dị nta enweghị ihe dịbigara nta oké.”+
16 Ma ekele dịrị Chineke maka itinye n’obi Taịtọs+ otu ịdị ọkụ n’obi ahụ e nwere maka unu, 17 n’ihi na ọ nabatara agbamume ahụ n’ezie, ma, ebe ọ dị ya ọkụ n’obi nke ukwuu, ọ na-abịakwute unu dị ka o kpebiri n’onwe ya. 18 Ma anyị na-ezite ya na nwanna ahụ, onye a na-aja mma n’ọgbakọ niile n’ihi ihe ọ na-eme maka oziọma. 19 Ọ bụghị naanị nke ahụ, kama ọgbakọ ndị ahụ họpụtakwara+ ya ka o soro anyị na-ejegharị n’ihe banyere onyinye obiọma a nke anyị na-eje ozi maka ya iji nye Onyenwe anyị otuto,+ iji gosikwa na anyị dị njikere.+ 20 Ya mere, anyị na-ezere ime ka onye ọ bụla hụta mmejọ+ n’aka anyị n’ihe banyere onyinye mmesapụ aka+ nke a anyị na-eje ozi maka ya. 21 N’ihi na anyị “ji ime ihe n’eziokwu na-eme ndokwa, ọ bụghị naanị n’anya Jehova, kamakwa n’anya ụmụ mmadụ.”+
22 Anyị na-ezitekwa ha na nwanna anyị, onye anyị chọpụtaworo ọtụtụ mgbe n’ọtụtụ ihe na ọ dị ọkụ n’obi, ma ugbu a, ọ dị ọkụ n’obi nke ukwuu karị n’ihi obi ike dị ukwuu o nwere n’ebe unu nọ. 23 Otú ọ dị, ọ bụrụ na e nwere ajụjụ ọ bụla banyere Taịtọs, ọ bụ onye òtù m na onye ọrụ ibe m+ maka ọdịmma unu; ma ọ bụ, n’ihe banyere ụmụnna anyị, ha bụ ndịozi nke ọgbakọ dị iche iche na ebube nke Kraịst. 24 Ya mere, gosinụ ha ihe àmà nke ịhụnanya unu+ na ihe anyị ji nyaa isi+ banyere unu, n’ihu ọgbakọ dị iche iche.