15 Lee, m nọnyeere gị, m ga-echebekwa gị n’ụzọ niile ị na-aga, m ga-akpọghachikwa gị n’ala a,+ n’ihi na agaghị m ahapụ gị ruo mgbe m meworo ihe m gwara gị.”+
29 Oge Izrel ga-anwụ wee ruo.+ O wee kpọọ Josef nwa ya wee sị ya: “Ugbu a, ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, biko, tinye aka gị n’okpuru apata ụkwụ m,+ gosi m obiọma* na ikwesị ntụkwasị obi.+ (Biko, elila m n’Ijipt.)+
13 Ụmụ ya wee buru ya gaa n’ala Kenan wee lie ya n’ọgba dị n’ala Mak-pila, n’ala Ebreham zụrụ Ifrọn onye Het nke dị n’ihu Mamri+ ka ọ bụrụ ebe ọ ga na-eli ozu.
8 M na-agbada ịga napụta ha n’aka ndị Ijipt+ nakwa ịkpọpụta ha n’ala ahụ kpọga ha n’ala dị mma, dịkwa obosara, n’ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,+ n’ógbè ndị Kenan na ndị Het na ndị Amọraịt na ndị Perizaịt na ndị Haịvaịt nakwa ndị Jibọs.+