14 “‘Ọ bụrụkwa na onye mbịarambịa bi n’etiti unu dị ka ọbịa, ya onwe ya kwa ga-akwadebe àjà ememme ngabiga a na-emere Jehova.+ Dị ka ụkpụrụ ememme ngabiga na usoro ya si dị ka ọ ga-eme ya.+ Otu ụkpụrụ ga-adịrị unu, ọ ga-adịrị ma onye mbịarambịa ma nwa afọ ala unu.’”+
2 Ị ga-achụkwara Jehova bụ́ Chineke gị anụ ememme ngabiga n’àjà,+ site n’ìgwè ewu na atụrụ nakwa site n’ìgwè ehi,+ n’ebe Jehova ga-ahọrọ ime ka aha ya biri.+
7 Wepụnụ ihe iko achịcha ochie ahụ, ka unu wee bụrụ ntụ ọka ọhụrụ a gwakọtara agwakọta,+ dị ka unu bụ ihe na-ekoghị eko. N’ihi na, n’ezie, a chụwo+ nwa atụrụ ememme ngabiga+ anyị n’àjà, ya bụ, Kraịst.+