7 Mgbasa ịchịisi ya+ na udo ya ga-agbasa agaghị enwe ọgwụgwụ,+ n’elu ocheeze Devid+ nakwa n’alaeze ya iji mee ka o guzosie ike+ nakwa iji jiri ikpe ziri ezi+ na ezi omume+ mee ka ọ dịgide, malite ugbu a ruo mgbe ebighị ebi. Ekworo Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emezu ihe a.+
13 Ma ị sịwo n’ime obi gị, ‘M ga-agbago n’eluigwe.+ M ga-ebuli ocheeze m+ ka ọ dị elu karịa kpakpando+ Chineke. M ga-anọdụ ala n’ugwu nzukọ,+ n’ime ime ebe ugwu.+
5 “Lee! Oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe m ga-eme ka ome ezi omume puoro Devid.+ Otu eze ga na-achị+ ma jiri ezi uche na-eme ihe, na-ekpekwa ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume n’ala a.+
19 Ya mere, e mewo ka okwu amụma ahụ+ bụrụ ihe anyị ji n’aka karị;+ unu na-emekwa nke ọma n’ịṅa ntị na ya dị ka oriọna+ nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị n’ime obi unu, ruo mgbe chi bọrọ, kpakpando ụtụtụ+ ewee nwuwe.
16 “‘Mụ onwe m, bụ́ Jizọs, zigara mmụọ ozi m ka ọ gbaara unu àmà banyere ihe ndị a maka ọgbakọ ndị a. Abụ m mgbọrọgwụ+ Devid, bụrụkwa nwa ya.+ Abụkwa m kpakpando ụtụtụ nke na-enwu gbaa.’”+