18N’oge ahụ, e nweghị eze n’Izrel.+ N’oge ahụkwa, ebo Dan+ nọ na-achọgharị ala ha ga-ebi; n’ihi na ruo n’ụbọchị ahụ, ha enwetabeghị ihe nketa n’etiti ebo niile nke Izrel.+
19N’oge ahụ, e nweghị eze n’Izrel.+ Ọ dị otu onye Livaị nke bi nwa mgbe n’ime ime ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu.+ Ka oge na-aga, ọ kpọọrọ otu nwaanyị onye Betlehem+ nke dị na Juda ka ọ bụrụ iko ya.+