10 Mmụọ+ Jehova wee dakwasị ya, o wee ghọọ onyeikpe Izrel. Mgbe ọ pụrụ gaa agha, Jehova nyere Kushan-rishateyim eze Siria n’aka ya nke mere na o meriri+ Kushan-rishateyim.
6 Mmụọ Jehova wee malite ịkpa ike n’ahụ́ ya,+ o wee dọwaa ya abụọ, dị nnọọ ka mmadụ si adọwa nwa mkpi, o jighịkwa ihe ọ bụla n’aka. Ọ gwaghịkwa nna ya na nne ya ihe o mere.
14 Ya onwe ya wee bịarute Lihaị, ndị Filistia wee tie mkpu ọṅụ mgbe ha hụrụ ya.+ Mmụọ Jehova+ wee malite ịkpa ike n’ahụ́ ya, ụdọ ndị ahụ e kere ya n’aka wee dị ka eriri ákwà linin a ṅara n’ọkụ,+ agbụ e kere ya n’aka wee gbazee.
11 Ha wee cheta oge dị anya gara aga, chetakwa ohu ya Mozis, sị: “Olee ebe Onye ahụ nke ji ndị na-azụ ìgwè atụrụ ya+ kpọpụta ha n’oké osimiri nọ?+ Olee ebe Onye nyere ya mmụọ nsọ ya nọ?+
6 O wee sị m: “Nke a bụ ihe Jehova gwara Zerọbabel, ‘“Ọ bụghị site n’ụsụụ ndị agha,+ ọ bụghịkwa site n’ike,+ kama ọ bụ site na mmụọ m,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.