10 Mmụọ+ Jehova wee dakwasị ya, o wee ghọọ onyeikpe Izrel. Mgbe ọ pụrụ gaa agha, Jehova nyere Kushan-rishateyim eze Siria n’aka ya nke mere na o meriri+ Kushan-rishateyim.
6 Mmụọ Jehova wee malite ịkpa ike n’ahụ́ ya,+ o wee dọwaa ya abụọ, dị nnọọ ka mmadụ si adọwa nwa mkpi, o jighịkwa ihe ọ bụla n’aka. Ọ gwaghịkwa nna ya na nne ya ihe o mere.
13 Samuel wee were mpi mmanụ+ ahụ tee ya mmanụ n’etiti ụmụnne ya. Mmụọ Jehova wee malite ịkpa ike n’ahụ́ Devid malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.+ E mesịa, Samuel biliri laa Rema.+