16 “Ụdị ugbu a echi, m ga-ezitere gị otu nwoke si n’ala Benjamin,+ tee ya mmanụ+ ịbụ onye ndú nke ndị m bụ́ Izrel; ọ ga-azọpụtakwa ndị m n’aka ndị Filistia,+ n’ihi na ahụwo m mmekpa ahụ́ nke ndị m, mkpu ákwá ha eruwokwa m ntị.”+
6 N’ihi ya, ọ sịrị ndị ikom ya: “Tụfịakwa! Dị ka Jehova si ele ihe anya, agaghị m eme onyenwe m ihe a, bụ́ onye Jehova tere mmanụ,+ site n’isetị aka m metụ ya, n’ihi na ọ bụ onye Jehova tere mmanụ.”+
27 N’agbanyeghị nke ahụ, ma Herọd ma Pọntiọs Paịlet,+ tinyere ndị mba ọzọ na ndị Izrel, zukọtara n’obodo a megide ohu gị dị nsọ,+ bụ́ Jizọs, onye i tere mmanụ,+
38 ya bụ, Jizọs onye Nazaret, otú Chineke si jiri mmụọ nsọ+ na ike tee ya mmanụ, o wee gazuo ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị niile Ekwensu na-emekpọ ọnụ;+ n’ihi na Chineke nọnyeere ya.+