10 O wee ruo echi ya+ na mmụọ na-adịghị mma nke si n’ebe Chineke nọ kpawara ike n’ahụ́ Sọl,+ nke mere na o mewere dị ka onye amụma+ n’ime ụlọ, ka Devid nọ na-akpọ ụbọ,+ dị ka ọ na-eme na mbụ; Sọl jikwa ube n’aka.+
13 N’oge ọnwụnwa,+ ka onye ọ bụla ghara ịsị: “Ọ bụ Chineke na-anwa m.” N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.