10 O wee ruo echi ya+ na mmụọ na-adịghị mma nke si n’ebe Chineke nọ kpawara ike n’ahụ́ Sọl,+ nke mere na o mewere dị ka onye amụma+ n’ime ụlọ, ka Devid nọ na-akpọ ụbọ,+ dị ka ọ na-eme na mbụ; Sọl jikwa ube n’aka.+
6 Sọl wee nụ na a hụwo Devid na ndị ikom ya na ha nọ, mgbe Sọl nọ ọdụ na Gibia n’okpuru osisi tamarisk+ n’ebe dị elu, jirikwa ube+ ya n’aka, ndị niile na-ejere ya ozi guzokwa ya gburugburu.
12 Devid wee were ube ahụ na ihe mmiri ahụ dị n’akụkụ isi Sọl, ha wee pụwa; ọ dịghịkwa onye hụrụ ha+ ma ọ bụ onye matara ihe merenụ ma ọ bụ onye tetara, ebe ha niile nọ n’ụra, n’ihi na ọ bụ oké ụra+ nke si n’ebe Jehova nọ buuru ha.