7 Mgbe ahụ, Boaz riri ihe ma ṅụọ ihe ọṅụṅụ, obi wee dị ya ụtọ.+ O wee gaa dinara ala na nsọtụ ebe e kpokọtara ọka. Mgbe o dinaara, Rut ji nwayọọ bịa kpughee ákwà o ji kpuchie ụkwụ wee dinara ala.
36 E mesịa, Abigel bịakwutere Nebal, ọ nọkwa n’ebe ahụ na-enwe oriri n’ụlọ ya dị ka oriri onye eze;+ obi Nebal na-enwekwa aṅụrị n’ime onwe ya, ọ ṅụrọkwara anya;+ ọ gwaghịkwa ya ihe ọ bụla, ma ọ bụ ihe nta ma ọ bụ ihe ukwu, ruo mgbe chi bọrọ.
3 Eji m obi m mee nnyocha site n’iji mmanya+ mee onwe m obi ụtọ, mgbe m ji amamihe+ na-eduzi obi m, ọbụna izuzu nzuzu ruo mgbe m hụrụ uru ụmụ mmadụ ritere n’ihe ha ji ụbọchị ndụ+ ha mee n’okpuru eluigwe.