36 Lee! Ụmụ ha abụọ, Ahimaz+ nwa Zedọk na Jọnatan+ nwa Abayata sokwa ha nọrọ n’ebe ahụ; ọ bụkwa ha ka unu ga-ezi ihe ọ bụla unu ga-anụta ka ha bịa zie m.”
16 Ugbu a, zie ozi ọsọ ọsọ gwa Devid,+ sị, ‘Anọla na mbara ọzara nke ala ịkpa n’abalị a, kama hụ na ị gafeere,+ ka a ghara ilomi+ eze na ndị niile so ya.’”
21 O wee ruo mgbe ha lawara na ha si n’olulu mmiri ahụ pụta wee gaa kọọrọ ya Eze Devid wee sị Devid: “Bilienụ gafee mmiri a ngwa ngwa; n’ihi na lekwa ihe Ahitofel dụrụ n’ọdụ+ ka e mee unu.”