4 N’ihi ya, Ehab batara n’ụlọ ya, nọrọ ná mwute ma gbarụọ ihu n’ihi okwu Nebọt onye Jezril gwara ya, mgbe ọ sịrị: “Agaghị m enye gị ihe nketa nna nna m hà.” O wee dinara n’ihe ndina ya, ma chee ihu ya ebe ọzọ,+ o righịkwa nri.
21 lee, m ga-eme ka ọdachi dakwasị gị;+ m ga-ebibikwa gị+ ma bipụ onye ọ bụla bụ́ nwoke+ nke si n’ahụ́ Ehab na onye na-enweghị enyemaka na onye na-abaghị n’ihe n’Izrel.
10Ehab nwere ụmụ ndị ikom iri asaa+ na Sameria.+ Ya mere, Jihu dere akwụkwọ ozi zigara ndị isi+ Jezril, ndị okenye+ na ndị na-elekọtara Ehab ihe na Sameria, sị: