18 “‘Dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Eze, onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ kwuru, ‘ọ ga-abata wee dị otú Tebọ+ dị n’etiti ugwu ndị ọzọ, dịkwa otú ugwu Kamel+ dị n’akụkụ oké osimiri.
“Jehova ga-esi na Zayọn bigbọọ,+ ọ ga-esikwa na Jeruselem mee ka a nụ olu ya;+ ala ịta ahịhịa nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru uju, elu elu ugwu Kamel ga-akpọkwa nkụ.”+