19 Ugbu a, zipụ ozi, kpọkọtara m Izrel dum n’Ugwu Kamel+ nakwa narị ndị amụma Bel+ anọ na iri ise nakwa narị mmadụ anọ bụ́ ndị amụma nke ogwe osisi dị nsọ,+ bụ́ ndị na-eri ihe na tebụl Jezibel.”+
2 Ọ ghaghị ịwa okooko,+ ọ ga-aṅụrịkwa ọṅụ nke ukwuu, tiekwa mkpu ọṅụ.+ A ga-enye ya ebube nke Lebanọn,+ na ịma mma nke Kamel+ na nke Sharọn.+ A ga-enwe ndị ga-ahụ ebube Jehova,+ bụ́ ịma mma nke Chineke anyị.+
18 “‘Dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Eze, onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ kwuru, ‘ọ ga-abata wee dị otú Tebọ+ dị n’etiti ugwu ndị ọzọ, dịkwa otú ugwu Kamel+ dị n’akụkụ oké osimiri.