3Mozis wee ghọọ onye na-azụ ìgwè ewu na atụrụ Jetro,+ onye nchụàjà Midian, bụ́ nna nwunye ya.+ Ka o du ìgwè ewu na atụrụ ahụ na-aga n’ebe ọdịda anyanwụ n’ala ịkpa ahụ, o mesịrị bịarute n’ugwu nke ezi Chineke,+ na Horeb.+
11 E mesịa, mmụọ ozi Jehova bịara+ nọdụ ọdụ n’okpuru nnukwu osisi dị n’Ọfra, bụ́ nke Joash onye Abi-iza,+ mgbe Gidiọn+ nwa ya nọ na-eticha ọka wit n’ebe nzọchapụta mmanya iji bupụ ya ngwa ngwa ka ndị Midian ghara ịhụ ya.
8 Nke a bụ ihe ị ga-agwa ohu m Devid, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Mụ onwe m si n’ala ịta ahịhịa, n’ebe ị na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ,+ kpọrọ gị ka ị bụrụ onye ndú+ nke ndị m Izrel.