7 Eze Izrel wee sị Jehọshafat:+ “A ka nwere otu nwoke+ a ga-esi n’ọnụ ya jụọ Jehova ase, ma akpọrọ m ya asị,+ n’ihi na ọ dịghị eburu m amụma ihe ọma kama ọ bụ amụma ihe ọjọọ+ ka ọ na-eburu m ụbọchị ya niile. Ọ bụ Mịkaya nwa Imla.”+ Otú ọ dị, Jehọshafat sịrị: “Eze, ekwula otú ahụ.”+
4 Ndị isi wee gwa eze, sị: “Biko, ka e gbuo nwoke a,+ n’ihi na ọ na-akụda ndị agha fọdụrụ n’obodo a aka, tinyere mmadụ niile, site n’ịgwa ha ihe ndị a ọ na-agwa ha.+ N’ihi na nwoke a achọghị ka ndị a nwee udo kama ọ bụ ka ọdachi dakwasị ha.”