24 N’ihi na ihe niile dị n’akụkụ nke a nke Osimiri Yufretis+ dị n’okpuru ya, malite na Tifsa ruo Geza,+ ọbụna ndị eze niile nọ n’akụkụ nke a nke Osimiri Yufretis;+ o nwekwara udo+ n’ógbè ya niile, gbaa gburugburu.
6 O wee wuo obodo ndị siri ike na Juda,+ n’ihi na ala ahụ enweghị nsogbu ọ bụla; e busoghịkwa ya agha n’ime afọ ndị a, n’ihi na Jehova nyere ya ezumike.+
3 N’ihi na anyị onwe anyị bụ́ ndị nwere okwukwe na-abanye n’izu ike ahụ, dị nnọọ ka o kwuru, sị: “Ya mere, aṅụrụ m iyi+ n’iwe m, sị, ‘Ha agaghị abanye+ n’izu ike m,’”+ ọ bụ ezie na ọrụ ya gwụsịrị+ malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.+