8 Onye ahụ na-ejere Sọl ozi wee zaakwa ya, sị: “Lee! M ji otu ụzọ n’ụzọ anọ nke shekel+ ọlaọcha, m ga-enyekwa ya onye nke ezi Chineke, ọ ga-agwakwa anyị ụzọ anyị ga-esi.”
5 Eze Siria wee sị: “Jikere ka ị gawa! Bịa, ka m zigara eze Izrel akwụkwọ ozi.” O wee gawa, were+ talent ọlaọcha iri na puku mkpụrụ ọlaedo+ isii na uwe mgbanwe+ iri.