2 Ya mere, Jeroboam sịrị nwunye ya: “Biko, bilie jigharịa ejiji+ ka a ghara ịmata na ị bụ nwunye Jeroboam, gaakwa Shaịlo. Lee! N’ebe ahụ ka Ahaịja+ onye amụma nọ. Ọ bụ ya gwara m okwu banyere mụ ịghọ eze nke ndị a.+
11 Jehọshafat wee sị:+ “Ọ̀ bụ na e nweghị onye amụma Jehova+ n’ebe a? Ka anyị jụọ Jehova ase site n’ọnụ ya.”+ Otu n’ime ndị na-ejere eze lzrel ozi wee zaa, sị: “E nwere Ịlaịsha+ nwa Shefat n’ebe a, bụ́ onye wụsara mmiri n’aka Ịlaịja.”+
13 Gaanụ jụọ Jehova ase+ n’aha m nakwa n’aha ndị ala anyị nakwa n’aha Juda dum banyere ihe e kwuru n’akwụkwọ a a hụrụ; n’ihi na ọnụma Jehova+ nke e mere ka o nwuru ọkụ n’ebe anyị nọ dị ukwuu n’ihi na nna nna anyị hà+ egeghị ntị n’ihe e kwuru n’akwụkwọ a site n’ime ihe niile e dere banyere anyị.”+