20 “Jehova ga-eme ka ọbụbụ ọnụ,+ ọgba aghara+ na ịba mba+ dakwasị gị n’ihe ọ bụla ị na-eme bụ́ nke ị na-agbalị ime, ruo mgbe e kpochapụrụ gị, i wee laa n’iyi ọsọ ọsọ, n’ihi omume ọjọọ gị, ebe ọ bụ na ị hapụwo m.+
20 Mmụọ+ Chineke wee kpuchie+ Zekaraya+ nwa Jehoyada+ onye nchụàjà, o wee guzoro n’ihu ìgwè mmadụ wee sị ha: “Nke a bụ ihe ezi Chineke kwuru, ‘Gịnị mere unu ji na-emebi ihe Jehova nyere n’iwu, nke ga-eme ka ihe ghara ịgaziri unu?+ Ebe ọ bụ na unu ahapụwo Jehova, ya onwe ya ga-ahapụ unu.’”+