7 Ma Jehova sịrị Samuel: “Elela anya n’ọdịdị ya na ogo ya,+ n’ihi na ajụwo m ya. N’ihi na ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ,+ n’ihi na mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ;+ ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.”+
39 mgbe ahụ, gị onwe gị nọrọ n’eluigwe,+ bụ́ ebe obibi gị guzosiri ike,+ nụrụ, gbagharakwa+ wee mee ihe+ ma kwụọ onye ọ bụla ụgwọ dị ka ụzọ ya niile si dị,+ n’ihi na ị maara obi ya+ (n’ihi na ọ bụ naanị gị maara obi ụmụ mmadụ niile nke ọma);+