17 Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma,+ ire ọ bụla nke ga-ekwu okwu megide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe.+ Nke a bụ ihe nketa nke ndị ohu Jehova,+ ezi omume ha si n’ebe m nọ,” ka Jehova kwuru.+
11 “N’ihi na m nọnyeere gị,” ka Jehova kwuru, “ịzọpụta gị;+ ma m ga-ekpochapụ mba niile m chụgara gị.+ Otú ọ dị, agaghị m ekpochapụ gị.+ M ga-agbazi gị ruo n’ókè kwesịrị ekwesị, n’ihi na agaghị m ahapụ inye gị ntaramahụhụ.”+
8 “‘Lee! Anya Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova na-ele alaeze nke na-eme mmehie.+ Ọ ga-ekpochapụkwa ya n’elu ala.+ Ka o sina dị, m gaghị ekpochapụ ụlọ Jekọb kpamkpam,’+ ka Jehova kwuru.