16 A ga-atụpụ ndị ahụ ha na-eburu amụma n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem n’ihi ụnwụ na mma agha, ọ dịghị onye ga-eli ha—ha onwe ha, ndị nwunye ha na ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom.+ M ga-awụkwasị ha ọdachi ha.’+
4 ‘Ọrịa dị iche iche ga-egbu ha.+ A gaghị akwara ha ákwá arịrị,+ a gaghịkwa eli ha eli.+ Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala;+ mma agha na ụnwụ ga-ala ha n’iyi,+ ozu ha ga-abụrụ anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa ihe oriri.’+