Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 15:8
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 8 N’ihi na ị ga-emesapụrụ ya aka+ ma hụ na ị gbazinyere ya ihe n’ibé otú ọ chọrọ, bụ́ ihe ndị na-akpa ya.

  • Job 31:16
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 16 Ọ bụrụ na m na-egbochibu ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha inweta ihe na-atọ ha ụtọ,+

      Ọ bụrụkwa na m na-eme ka anya nwaanyị di ya nwụrụ gharakwa ịhụ ụzọ,+

  • Abụ Ọma 37:26
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 26 Ọ na-eme amara ogologo ụbọchị dum, na-agbazinyekwa ihe,+

      N’ihi ya, ụmụ ya ga-enweta ngọzi.+

  • Abụ Ọma 41:1
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 41 Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe;+

      Jehova ga-emere ya ụzọ mgbapụ n’ụbọchị ọdachi.+

  • Ilu 14:21
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 21 Onye na-eleda mmadụ ibe ya anya na-eme mmehie,+ ma obi ụtọ na-adịrị onye na-emere ndị nọ n’ahụhụ amara.+

  • Ilu 17:5
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 5 Onye na-akwa onye dara ogbenye emo akọchawo Onye kere ya.+ Onye na-aṅụrị ọṅụ n’ọdachi onye ọzọ agaghị agbanahụ ntaramahụhụ.+

  • Ilu 19:17
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 17 Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe,+ Ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.+

  • Ilu 21:13
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 13 Onye ọ bụla nke na-emechi ntị ya ka ọ ghara ịnụ ákwá mkpesa nke onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya,+ ya onwe ya ga-akpọ òkù ma a gaghị aza ya.+

  • Luk 6:35
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 35 Kama nke ahụ, na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-emekwanụ ihe ọma, na-agbazinyekwa ihe+ n’anaghị ọmụrụ nwa, n’enweghị olileanya inweta ihe ọ bụla; ụgwọ ọrụ unu ga-adịkwa ukwuu, unu ga-abụkwa ụmụ nke Onye Kasị Elu,+ n’ihi na o nwere obiọma+ n’ebe ndị na-enweghị ekele na ndị ọjọọ nọ.

  • Luk 23:50
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 50 Ma, lee! otu nwoke aha ya bụ Josef, onye bụ́ onye òtù Nzukọ,* ọ bụkwa ezi mmadụ na nwoke ezi omume+—

  • Ọrụ Ndịozi 20:35
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 35 Egosiwo m unu n’ihe niile na site n’ịdọgbu onwe unu n’ọrụ+ otú a, unu aghaghị inyere ndị na-adịghị ike aka,+ unu aghaghịkwa iburu okwu Onyenwe anyị Jizọs n’uche, mgbe ya onwe ya sịrị, ‘A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe+ karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.’”

  • Ndị Hibru 13:16
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 16 Unu echefukwala ime ihe ọma+ na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya