4 “Ṅaanụ m ntị, unu ndị m; unu mba nke m,+ geenụ m ntị. N’ihi na iwu ga-esi n’ebe m nọ pụta,+ m ga-emekwa ka mkpebi ikpe m dịrị ka ìhè nye ndị dị iche iche.+
4 N’ihi na ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere+ ha iji nye anyị ntụziaka,+ ka anyị wee site ná ntachi obi+ anyị na nkasi obi+ sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.+
16 Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke,+ ọ bara uru iji ya zie ihe,+ iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị,+ iji ya mee ka ihe guzozie,+ na iji ya nye ọzụzụ+ n’ezi omume,
19 Ya mere, e mewo ka okwu amụma ahụ+ bụrụ ihe anyị ji n’aka karị;+ unu na-emekwa nke ọma n’ịṅa ntị na ya dị ka oriọna+ nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị n’ime obi unu, ruo mgbe chi bọrọ, kpakpando ụtụtụ+ ewee nwuwe.