18 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru, bụ́ Onye kere eluigwe,+ Onye bụ́ ezi Chineke,+ Onye kpụrụ ụwa na Onye kere ya,+ Onye mere ka o guzosie ike,+ onye na-ekeghị ya n’efu, onye kpụrụ ya ka e biri n’ime ya:+ “Abụ m Jehova, e nweghị onye ọzọ.+
6 o jikwa Onye ahụ nke na-adị ndụ+ ruo mgbe niile ebighị ebi,+ bụ́ onye kere eluigwe na ihe ndị dị n’ime ya, na ụwa+ na ihe ndị dị n’ime ya,+ na oké osimiri na ihe ndị dị n’ime ya, ṅụọ iyi, sị: “A gakwaghị egbu oge;+