33 Mozis wee nye ụmụ Gad+ na ụmụ Ruben+ na ọkara ebo Manase+ nwa Josef ala nke Saịhọn+ bụ́ eze Amọraịt chịrị na ala nke Ọg+ bụ́ eze Beshan chịrị, ya bụ, ala nke obodo ndị dị n’ókèala ha, tinyere obodo ndị gbara ala ahụ gburugburu.
12 Anyị wee weghara ala a n’oge ahụ; enyewo m ụmụ Ruben na ụmụ Gad+ ala malite n’Aroa,+ nke dị n’akụkụ iyi ndagwurugwu Anọn, na ọkara ógbè Gilied nke bụ́ ugwu ugwu nakwa obodo ya dị iche iche.
12Ndị a bụ ndị eze na-achị ala ụmụ Izrel meriri, ndị ha weghaara ala ha n’akụkụ ọwụwa anyanwụ+ nke Jọdan, malite n’iyi ndagwurugwu Anọn+ ruo n’Ugwu Hemọn,+ tinyere Araba+ dum nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ:
22 “I wee nye ha alaeze dị iche iche+ na ndị dị iche iche, keekwa ha ná mpaghara ná mpaghara;+ ha wee nweta ala nke Saịhọn,+ bụ́ ala nke eze Heshbọn,+ nakwa ala nke Ọg+ eze Beshan.+