10 Devid wee gaa n’ihu ịsị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ Jehova n’onwe ya ga-eme ya ihe;+ ma ọ bụkwanụ ụbọchị ya ga-eru,+ o wee nwụọ, ma ọ bụ, ọ ga-aga agha,+ e wee laa ya n’iyi.+
4 Sọl wee sị onye na-eburu ya ihe agha: “Mịrị mma agha gị+ maa m, ka ndị a a na-ebighị úgwù+ ghara ịbịa were mma agha ha magbuo m ma mee m ihe na-adịghị mma.” Ma obi ekweghị onye na-eburu ya ihe agha ime ya,+ n’ihi na egwu ji ya nke ukwuu. Sọl wee mịrị mma agha dakwasị na ya.+