6 Mgbe ahụ ka onye ngwọrọ ga-awụli elu dị ka oké ele,+ ire onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ.+ N’ihi na mmiri ga na-agbapụta n’ala ịkpa, mmiri iyi ga na-agbapụtakwa na mbara ọzara.
3 N’ihi na Jehova ga-akasi Zayọn obi.+ Ọ ga-akasikwa ebe ya niile tọgbọrọ n’efu obi,+ ọ ga-eme ka ala ịkpa ya dị ka Iden,+ meekwa ka mbara ọzara ya dị ka ubi Jehova.+ Obi ụtọ na ọṅụ ga-adị n’ime ya, a ga na-anụkwa ekele na abụ olu ụtọ n’ime ya.+
35 Ndị mmadụ ga-asịkwa: “Ala ahụ dị ebe ahụ nke bụbu ebe tọgbọrọ n’efu adịla ka ogige Iden,+ obodo ndị ahụ bụbu mkpọmkpọ ebe, ndị e mekwara ka ha tọgbọrọ n’efu, ndị e tidakwara etida, abụrụwo ebe e wusiri ike; e biriwo na ha.”+