9 E nwere onye amụma Jehova nọ n’ebe ahụ nke aha ya bụ Oded. O wee gakwuru ndị agha ahụ na-alọta Sameria wee sị ha: “Lee! Ọ bụ n’ihi oké iwe+ nke Jehova bụ́ Chineke nna nna unu hà na-eweso Juda mere o ji nyefee ha n’aka unu, unu wee jiri ọnụma+ nke ruru n’eluigwe+ gbuo ụfọdụ n’ime ha.
16 Ma ha ji ndị ozi nke ezi Chineke na-eme ihe ọchị,+ na-eledakwa okwu ya anya+ ma na-akwa+ ndị amụma ya emo, ruo mgbe ọnụma+ Jehova bịakwasịrị ndị ya, ruo mgbe ọ na-enweghị ihe ga-egbochi ya.+
25 O wee na-awụkwasị ya ọnụma ya na iwe ya, meekwa ka agha kpaa ya aka ọjọọ.+ O wee na-ere ya ka ọkụ n’akụkụ niile,+ ma ọ maghị;+ ọ nọkwa na-ere ka ọkụ megide ya, ma o tinyeghị ya n’obi.+