22 M ga-eji ọrịa na-efe efe+ na ọbara+ kpee ya ikpe.+ M ga-emekwa ka nnukwu mmiri na akụ́ mmiri ígwé,+ ọkụ na sọlfọ+ zokwasị ya na ìgwè ndị agha ya na ọtụtụ ndị ga-eso ya.+
8 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Mgbe e mesịrị ka ọ dị ebube,+ o zigara m ná mba ndị nọ na-ebukọrọ ihe unu;+ n’ihi na onye na-emetụ unu aka+ na-emetụ mkpụrụ anya m aka.+
3 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ+ na m ga-eme ka Jeruselem bụrụ nkume dị arọ+ nye ndị niile. Ọ ghaghị ịkawasị ndị niile buliri ya ahụ́; mba niile nke ụwa ga-ezukọta imegide ya.+