5Gaanụ jegharịa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem ka unu lee, mata, chọọkwa n’ámá ya dị iche iche ma ọ̀ dị onye unu pụrụ ịhụ,+ ma è nwere onye na-eme ihe ziri ezi,+ onye ọ bụla nke na-achọ ikwesị ntụkwasị obi,+ m ga-agbagharakwa obodo a.
2 A sị nnọọ na m nwere ebe ndị njem na-arahụ n’ala ịkpa!+ M gaara ahapụ ndị m, si n’ebe ha nọ pụọ, n’ihi na ha niile bụ ndị na-akwa iko,+ nzukọ ukwu nke ndị aghụghọ;+
11 Ndị Izrel niile emebiwokwa iwu gị, ha ahapụwo gị site n’ịjụ irube isi n’ihe i kwuru,+ i wee mee ka ọbụbụ ọnụ na ịṅụ iyi nke e dere n’iwu Mozis ohu ezi Chineke mezuo n’isi anyị,+ n’ihi na anyị emehiewo Ya.
13 Ahụhụ ga-adịrị ha,+ n’ihi na ha agbapụwo n’ebe m nọ!+ A ga-ebukọrọ ihe niile ha nwere, n’ihi na ha emehiewo m! Abụ m onye mgbapụta ha,+ ma ha onwe ha aghagidewo m ụgha.+