20 “‘Otú ọ dị, onye amụma nke ji mpako were aha m kwuo ihe m na-enyeghị ya iwu ka o kwuo,+ ma ọ bụ nke kwuru okwu n’aha chi ọzọ,+ onye amụma ahụ ga-anwụ.+
15 Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere ndị amụma ahụ na-ebu amụma n’aha m, ndị mụ onwe m na-edunyeghị, ndị na-asị na mma agha agaghị abịakwasị ala a, na ụnwụ agaghịkwa ada na ya, ‘A ga-eji mma agha na ụnwụ laa ndị amụma ahụ n’iyi.+
24 N’ihi na Kraịst ụgha+ na ndị amụma ụgha+ ga-ebili, ha ga-emekwa ihe ịrịba ama+ na ihe ijuanya dị ukwuu ka ha wee duhie ọbụna ndị a họọrọ, ma ọ bụrụ na o kwere omume.+