4Ụmụ Izrel, nụrụnụ okwu Jehova, n’ihi na Jehova nwere okwu ikpe megide ndị bi n’ala a,+ n’ihi na eziokwu+ na obiọma* na ihe ọmụma banyere Chineke adịghị n’ala a.+
2 Nụrụnụ okwu ikpe Jehova, unu ugwu niile, nụrụkwanụ, unu ihe ndị na-adịte anya, unu ntọala ụwa;+ n’ihi na Jehova na ndị ya nwere okwu ikpe, ọ bụkwa ya na Izrel ga-arụrịta ụka:+