15 Otú a ka o si dọrọ Jehoyakin+ n’agha laa Babịlọn;+ o wee si na Jeruselem kpụrụ nne eze+ na ndị nwunye eze na ndị na-eje ozi n’obí ya+ na ndị isi ala ahụ ka ha bụrụ ndị a dọọrọ n’agha laa Babịlọn.
10 O wee ruo ná mmalite+ afọ na Eze Nebukadneza zipụrụ+ ndị ikom ya ka ha kpụta ya Babịlọn+ ma bute arịa ndị mara mma dị n’ụlọ Jehova.+ O mekwara Zedekaya+ nwanne nna ya eze Juda nakwa Jeruselem.+
28 Nwoke a bụ́ Konaya+ ọ̀ bụ arịa nkịtị e ledara anya, nke a kụriri akụri,+ ka ọ̀ bụ arịa mmadụ na-enweghị mmasị na ya?+ Gịnị mere a ga-eji tụda ya na mkpụrụ ya n’ala, tụgakwa ha n’ala ha na-amaghị?’+