14 Jehova wee sị m: “Ọ bụ amụma ụgha ka ndị amụma na-ebu n’aha m.+ Ọ bụghị m dunyere ha, enyeghịkwa m ha iwu, agwaghịkwa m ha okwu.+ Ọhụụ ụgha na ịgba afa na ihe na-abaghị uru+ na aghụghọ nke dị n’obi ha ka ha ji na-eburu unu amụma.+
8 “‘Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “‘Ebe ọ bụ na unu ekwuwo ihe na-abụghị eziokwu, unu ahụwokwa ụgha n’ọhụụ, n’ihi ya, m na-emegide unu,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”
2Ma, e nwekwara ndị amụma ụgha n’etiti ndị Izrel, dị ka a ga-enwekwa ndị ozizi ụgha n’etiti unu.+ Ha ga-eji nwayọọ webata òtù dị iche iche na-ebibi ihe, ha ga-agọnahụkwa ọbụna onye nwe ha nke zụtara ha,+ wetara onwe ha mbibi ngwa ngwa.