4 E wee kwatuo mgbidi obodo+ ahụ, ndị agha niile wee si n’ụzọ ọnụ ụzọ ámá nke dị n’agbata mgbidi abụọ ndị dị n’akụkụ ubi eze gbaa ọsọ n’abalị,+ ka ndị Kaldia+ gbara obodo ahụ gburugburu ibuso ya agha; eze wee gbara gawa+ n’ụzọ gara Araba.+
5 M ga-enyefe ihe niile a kwakọbara n’obodo a na ihe niile e mepụtara na ya na ihe niile dị oké ọnụ ahịa dị n’ime ya n’aka ndị iro ha; m ga-enyefekwa akụ̀ niile nke ndị eze Juda n’aka ndị iro ha.+ Ha ga-akwakọrọ ha, bukọrọkwa ha laa Babịlọn.+
4 ‘Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru: “Lee, m ga-eme ka ngwá agha unu ji tụgharịa megide unu, ya bụ, ngwá agha unu ji na-ebuso eze Babịlọn+ na ndị Kaldia+ nọchibidoro unu ná mpụga mgbidi unu agha, m ga-ekpokọta ha n’etiti obodo a.+