10 Lee, enyefewo m mba dị iche iche na alaeze dị iche iche n’aka gị,+ ka i wee na-efopụ ma na-akwada, na-ebibi ma na-etida,+ na-ewu ihe ma na-akụ mkpụrụ.”+
19 Ọ ga-erukwa na unu ga-asị, ‘Gịnị mere Jehova bụ́ Chineke anyị ji mee anyị ihe a niile?’+ Ị ga-asịkwa ha, ‘Dị nnọọ ka unu hapụrụ m gaa na-efe chi ala ọzọ n’ala unu, otú ahụ ka unu ga na-ejere ndị ala ọzọ ozi n’ala na-abụghị nke unu.’”+
17 “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Onye kụrụ gị,+ ekwuwo na ọdachi ga-adakwasị gị n’ihi ihe ọjọọ nke ụlọ Izrel+ na ụlọ Juda mere iji kpasuo m iwe site n’isurere Bel ihe nsure ọkụ.”+
10 “‘“N’ihi na echewo m ihu n’obodo a iwetara ya ọdachi, ọ bụghị imere ya ihe ọma,”+ ka Jehova kwuru. A ga-enyefe ya n’aka eze Babịlọn,+ ọ ga-agbakwa ya ọkụ.”+
28 “Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka m mụ anya n’ebe ha nọ+ ifopụ ha, kwatuo ha, tida ha, laa ha n’iyi, bibiekwa ha,+ otú ahụ ka m ga-amụ anya n’ebe ha nọ iwulite ha, kụọkwa ha dị ka mkpụrụ,”+ ka Jehova kwuru.