18 “‘Dị nnọọ ka m dị ndụ,’ ka Eze, onye aha ya bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ kwuru, ‘ọ ga-abata wee dị otú Tebọ+ dị n’etiti ugwu ndị ọzọ, dịkwa otú ugwu Kamel+ dị n’akụkụ oké osimiri.
37 “Ugbu a, mụ onwe m, Nebukadneza, na-eto ma na-ebuli Eze eluigwe elu, na-ajakwa ya mma,+ n’ihi na ọrụ ya niile bụ eziokwu, ụzọ ya niile bụkwa ikpe ziri ezi,+ nakwa n’ihi na o nwere ike iweda ndị ji mpako na-eje ije ala.”+
14 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye na-aghọ aghụghọ bụ mgbe o nwere anụ nke ahụ́ dị mma, nke bụ́ oké n’ìgwè anụ ya, ma ya ana-ekwe nkwa, jiri nke ahụ́ na-adịghị mma na-achụrụ Jehova àjà.+ N’ihi na abụ m Eze ukwu,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, “aha m ga-adịkwa egwu n’etiti mba niile.”+